Crime Facts Blog FactCheck (Igbo) Nyocha Eziokwu: Foto abụọ gosiri na ọ bu Maazị Chibezie Onocha ka ndị uweojii Kano jídéré maka ire ọgwụ adịgboroja, na eduhie eduhie
FactCheck (Igbo)

Nyocha Eziokwu: Foto abụọ gosiri na ọ bu Maazị Chibezie Onocha ka ndị uweojii Kano jídéré maka ire ọgwụ adịgboroja, na eduhie eduhie

Featured Image: Victor Agbo wrongly described as Chibezie Onocha

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E kwuru: Akwụkwọ akụkọ ịntanetị, aha ya bu Igboradio bipụtara akụkọ na ụbọchị Eprel 22 na afọ 2023 na foto abụọ kwụrụ na ndị uweojii Kano jidere nwoke na-ere ọgwụ adịgboroja aha ya bu Maazị Chibezie Onocha.

Ihe Anyi Chọpụtara: Akụkọ a na eduhie eduhie. Nyocha nke DUBAWA mere gosiri na ọ bụghị Maazị Chibezie Onocha no na foto abụọ ahụ, kama ọbu onye ọzọ na-ere ọgwụ ike, Victor Agbo, nke ndi uweojii Kano jídéré ebe o bu ahịhịa Igbo (India Hemp) dị narị abụọ na ise.

Akụkọ N’uju

Na ọnwa April, afọ 2022, akwụkwọ akụkọ ịntanetị ama nke ọma aha yá bu Igboradio , bipụtara akụkọ ya na foto abụọ kwụrụ na ndị uweojii nọ na Kano jídéré onye a na akpọ Maazị Chibezie Onocha, maka ire ọgwụ adịgboroja.

Akụkọ a Ìgboradio dere kwụrụ na ọ bu Maazị Chibezie Onocha bu onye nọ na foto abụọ ahụ. Akụkọ a siri na aka ndị uweojii na steeti Kano akpàrála otu nwoke a na enyo-enyo na ọ bụ onye na-atụ mgbere ọgwụ adịgboroja na steeti ahụ.

Maazị Onocha gbara ahọ iri abụọ na asaa, bụ onye a nwụchikọrọ na mpaghara ‘Sabon Gari Quarters’ dị na steeti ahụ.

Dịka ozi a kụpụụrụ ndị ntaakụkọ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Kano, bụ SP Abdullahi Haruna Kiyawa siri kọwaa, ọ bụ ndị ọrụ uweojii pụrụ iche a maara dịka ‘Operation Puff Adder’ jidere nwoke ahụ oge ha bagidere na mkpagharị nnyocha na mpaghara okporoụzọ IBB.

O mere ka a mara na ihe dị icheiche e nwetere n’aka nwoke ahụ gụnyèrè àkpà ọgwụ ‘Rubber Solution’ otu narị, igbe mkpụrụọgwụ ‘Buscomac Tablets’ ise, igbe mkpụrụọgwụ ‘GVN Griseofulvin Tablets’ ruru atọ, na igbe ọgwụ ‘Healmoxy Capsules’ abụọ, ma bụrụkwa nke mkpokọta ọnụego ha niile ruru nde naịra abụọ na ụma narị puku naịra ise na iri isii (N2,560,000).

SP Kiyawa kwuru na site na nnyocha e megoro nà ajụjụ ọnụ a gbagoro ya bụ nwoke, a chọpụtara na ọgwụ niile ahụ bụ adịgboroja, ma bụrụkwa nke o siri steeti Lagos bubàta na Kano, ma na-achọkwazị isi na Kano buru ha gaa mba ‘Niger Republic’.

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sịrị na onyeisi ndị uweojii na steeti Kano, bụ CP Samaila Shuaibu-Dikko enyela ntụziaka ka e mee nnyocha miri èmì banyere nwoke ahụ na ọgwụ ọdịgboroja ahụ; nke, mgbe e mechara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu mee tie ya mmọnwụ, dịka ihe o mere siri dị.

Nyocha

Mgbe elebara anya nkè ọma, DUBAWA chọpụta na ọ bụghi Maazị Chibezie Onocha bu onyé no na foto abụọ ahụ, kama ọ bu Victor Agbo, onye ọzọ ndị uweojii Kano nwuchiri maka ịbụ ọgwụ ike akporo Ahịhịa Igboo (India Hemp) dí naari abụọ na ịse.

Mgbe DUBAWA chọrọ foto nke mbụ na Google Reverse Image Search, achọpụtara na foto nke mbụ pụtara na weebụsaịtị ịsị. Weebụsaịtị ndị a gụnyere: Hausaloaded.com, Amebo9jafeed.com.ng, Igboradio, herald.ng, were gabazie.

Foto nke mbụ a gosiri weebụsaịtị dị iche iche bipụtara akụkọ maka onye aha ya bu Victor Agbo nke ndị Uweojii Kano jidere maka ịbụ ọgwụ ike

Achọpụtakwara na foto nke abụọ pụtara na akụkọ weebụsaịtị dị irí na otu, mgbe a chọrọ ya na Google. Ụfọdụ n’ime Weebụsaịtị ndị a bu: icirnigeria.org, DailyPost.ng, africa.press.net..

Foto nke abụọ a gosiri weebụsaịtị dị iche iche bipụtara akụkọ maka onye aha ya bu Victor Agbo nke ndị Uweojii Kano jidere maka ịbụ ọgwụ ike.

Akwụkwọ akụkọ TheICIR, dekwara na onwa April 17, 2022, na onyé no na foto abụọ ahụ ndị uweojii Kano jidere maka ịbụ ọgwụ ike akporo ahịhịa igbooọ bu Victor Agbo, ọ bụghị Maazị Chibezie Onocha.

 

Maazi Chibezie Onocha

Nchịkọta

Foto abụọ nke Igboradio dere akụkọ maka onye ndi uweojii Kano jidere na ere ọgwụ adịgboroja aha ya bu Chibezie Onocha, na eduhie eduhie. Onye no na foto abụọ ahụ bu Victor Agbo, ónyé ọzọ ndị Uweojii Kano nwuchiri maka ịbụ ọgwụ ike akporo ahịhịa igboo (Indian Hemp).

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na Nigeria

Exit mobile version