Crime Facts Blog FactCheck (Igbo) Nyocha Eziokwu: Iri Okporoko, ite urị ọnụ e ga-egbochi nwanyị ịtụrụ ime?
FactCheck (Igbo)

Nyocha Eziokwu: Iri Okporoko, ite urị ọnụ e ga-egbochi nwanyị ịtụrụ ime?

Foto Abụọ Ndị A Etikọrọnụ Ebe A Bụ Azụ Okporoko Na Uri Ọnụ

Pascal Ibe dere nyocha a

Ihe E Kwuru: Na akụkọ Hohaa com bipụtere na August 3, 2021, Ọkammụta Oladapo Ashiru, Onyeisi Academy of Medicine Specialties na Naijiria kwụrụ na iri okporoko ma ọ bu ite urị ọnụ ga eme ka nwanyị ghara itu ime.

Ihe Anyi Chọpụtara: Ka DUBAWA mechara nchoputa nile, ọ bu eziokwu na ụmụ nwaanyị na ata nnukwu azu okporoko ma ọ bu ite urị ọnụ oge obula nwere ike inwe nsogbu itụ ime n’ihi nnukwu kemịkalụ mercury na lead kemịkalụ dị na ime ha.

Akụkọ N’uju

Na 3 August, 2021, Onyeisi Academy of Medicine Specialties of Nigeria, Ọkammụta Oladapo Ashiru, kwụru sị na ihe ụfọdụ ụmụ nwanyị na-eme kwa ụbọchị so ebutere ha atụnwughi ime dịka ịta okporoko, ịgba ụkwụ ọtọ anya ụgbọala, ite urị ọnụ (lipstick).

Na akụkọ Hohaa.com bipụtere, Maazị Ashiru, nọrọ na mmemme nhiwe òtù ahụ na Legọs were kwuo na uche ndị mmadụ anaghị eru na ihe ndị ahụ.

Na nkuzi ya n’oge ahụ, ọkammụta na ngalaba mmụta bụ Anatomy jirikwa ọkwa dịka consultant reproductive endocrinologist, onye so na ndị malitere nnyocha nwanyị ịtụta ime site na enyemaka ụzọ ọgbara ọhụrụ bụ in vitro fertilisation n’afọ 1984 nke mere ya na ndị òtù ya jiri hụ maka ịmụ nwa “test tube” nke mbụ ya na mba Afrịka n’afọ 1986, kọwara na ajọ akparamagwa iri ihe (bad eating habits), nchekasị, ịgba ụkwụ ọtọ anya ụgbọala, ịta okporoko na azụ ndị ọzọ nwere oke Mercury nke na-egbu àkwá nwa (embryo).

Na okwu ya, “umunwaayi na-ete uri ọnụ amaghị na o bu nnukwu kemịkalụ.”

Nyocha

DUBAWA lelere na Google, were hụ na akwụkwọ ndị ọzọ dịka Vanguard, Punch, were dere gabazie, bipụtere ihe a dọkịta Oladapo Ashiru kwụru na asụsụ bekee.

Mgbe DUBAWA kpọtụrụ dọkịta na ahụ maka ọmụmụ (gyneacologist), dọkịta Micheal Stanley kwụrụ na ihe kpatara ụmụ nwaanyị nwere ike ha agaghị atụ ímé ma ha na ata okporoko oge obula ma ọbu na-ete urị ọnụ, bu na ihe ndị a nwere nnukwu kemịkalụ mercury na lead.

Na nkọwa ya, dọkịta Stanley, siri na odi mkpa ime ka ndị peshenti mata na enwere ụfọdụ kemịkalụ dị na okporoko nke nwéré ike emetụta ọmụmụ ha.

Dọkịta Stanley kwụrụ na oke ịta okporoko ndị nwere kemịkalụ mercury ga akpata enweghị homonụ zuru ezu. Ọ siri na nke a aga emetụta ọmụmụ nwaanyị ma ọ bụrụ na enweghị homonụ zuru ezu.

Na nke ite urị ọnụ, dọkịta Stanley siri na urị ọnụ ndị nwere nnukwu kemịkalụ lead nwere ike ikpata nwaanyị atula ime. Ọ kwụrụ na oge ụfọdụ, ụmụ nwaanyị na ete urị ọnụ amaghị ihe ndị eji rụọ urị ọnụ ndị a, nke gụnyere nnukwu kemịkalụ bu lead.

Dọkịta Stanley kowaputara na ihe ndị ọzọ na eso akpata enweghị ọmụmụ na umunwanyi bu orịa Tumor, ọrịa Fibroid, mkpọchi fallopian tube nke ọrịa infection na ebute, were dere gabazie.

Dọkịta ọzọ bu Mbachu Gerald kowara na ọ bu sọsọ mgbe nwaanyị na atakari okporoko ka ihe a ga emetụta ya.

Dọkịta Mbachu juru ajụjụ sị ndi Naijiria ole na-atakari azu okporoko oge obula?

”Anyị enweghịdị ego anyị ga-eji zụta anụ bụrụ ịbụ ma ya fọduzie ịzụta azụ okporoko dị oké ọnụ na Naijiria.

Dọkịta Mbachu sịri na obere okporoko ụmụ nwaanyị na-eri abụghị n’ezie ihe ga kpatara ha atughi ime.

Kedụ ka kemịkalụ mercury si eme ka nwaanyị ghara itu ime?

DUBAWA lebakwara anya na edemede nke weebụsaịtị ahụike, PubMed  bipụtere, nke kowara ka kemịkalụ mercury siri metụta ọmụmụ. Mercury bụ metal dị arọ nke na-eme na gburugburu ebe obibi.

Ọ bụrụ na mmadụ na-erikarị ụdị azụ̀ nwere nnukwu methylmercury, ọ nwere ike ịgbakọta n’ọbara ya ka oge na-aga.

Nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya gosikwara na enwere ike jikọta iri azụ nwere kemịkalụ mercury na amụghị nwa.

Kedụ kemicalu lead na egbughere ọnụ sịri metụta ọmụmụ?

DUBAWA chọpụtara na ọtụtụ urị ọnụ, nwere kemịkalụ lead. Na edemede ọzọ nke dị National Library Of Medicine kọwakwara na kemịkalụ lead nwere ike ịgbochi nwanyi ịturị ịme.

Nchịkọta

Ọ bu eziokwu bu ihe ọkàmmụta, dọkịta Oladapo Ashiru kwụru na ita okporoko ya na ite urị ọnụ, nwere ike ikpatara ụmụ nwaanyị atughi ịme, dịka dọkịta abụọ sịri kọwaa nke ọma n’ihi nnukwu kemịkalụ mercury na lead no na ha.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ.

Exit mobile version