Crime Facts Blog FactCheck (Igbo) Nyocha Eziokwu: Vidiyo ebiputere na X kwụrụ na idei mmiri mebiri ụzọ Abia gọvanọ Alex Otti rụrụ ọhụrụ, na eduhie eduhie
FactCheck (Igbo)

Nyocha Eziokwu: Vidiyo ebiputere na X kwụrụ na idei mmiri mebiri ụzọ Abia gọvanọ Alex Otti rụrụ ọhụrụ, na eduhie eduhie

Feature image: Abia State map (Punch Newspaper)

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E kwuru

Onye no na X platform bụ @DavidsOffor na ọnwa Maachị 26, biputere vidiyo ebe idei mmiri tochiri ụzọ dị na Aba nke Steeti Abia.

Ihe Anyị Chọpụta

DUBAWA chọpụtara na okporo ụzọ gọvanọ Alex Otti rụrụ nke @DavidsOffor kwụrụ na idei mmiri mebiri na nso nso a, na eduhie eduhie. Vidiyo ahụ bụ ihe mere na ọnwa Septemba na afọ 2023 nke gara aga. Ọzọkwa, ndị bi na mpaghara ahụ kwuputara na ụzọ ahụ ka dị mma.

Akụkọ N’uju

Otu onye na X bụ @DavidOffor na Maachị 26 2024, tinye vidiyo ebe idei mmiri tochiri ụzọ. Na vidiyo ahụ, ọ dere si na “N’agbanyeghị na gọvanọ Alex Otti bírí nnukwu ego ijeri naira maka ịrụ steeti Abia n’ọdịnihu, mana okporo ụzọ gọvanọ Otti rụrụ na nso nso a mebiri ka obere mmiri zoro.”

Mana o kwughị kpọmkwem ebe o mere na Aba. Vidiyo o tinyere na X nwetara nlele karịrị puku iri isii na ise, ọtụtụ ndị ọzọ nakwa agbasa ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ lelere vidiyo ahụ kwụrụ ihe dị iche iche banyere ihe ha hụrụ. Ụfọdụ si na ọ bu na Steeti Anambra ka vidiyo ahụ si, ọbughi Steeti Abia. Ebe ndị ọzọ kwụrụ si ndị gọọmenti anaghị enwekarị mmasị irụrụ ndị ha na achị ụzọ sịri ike n’agbanyeghị nnukwu ego ha na ebi.

Nyocha

Mgbe Dubawa mee nchọgharị onyonyo azụ sịte na vidiyo ahu, ọ chọpụtara na akwụkwọ Nairaland biputere akụkọ na ọnwa Septemba nke afọ 2023, gosiri na ọ bu ụzọ Cemetery Aba ka ide mmiri tochiri.

Dubawa chọpụtara na Channels TV  na 16 Septemba 2023 kọrọ ọrụ nke okporo ụzọ Cemetry ebe vidiyo idei mmiri a siri malite.

Mgbe Dubawa kpọrọ onye isi mgbasa ozi (Kọmishọna) na Abia Steeti bụ Maazị Okey Kanụ, ọ kọwara na vidiyo a hu aputala na Facebook na ọnwa Septemba na afọ gara-aga.

Maazị Kanu kwukwara na ụfọdụ ndị omekome na-ekesa otu vidiyo a na soshal midia n’oge na-adịbeghị anya. “Mana nke a abụghị ugbu a.”

Dubawa gbara ndị bi na Aba ajụjụ ọnụ maka ọnọdụ okporo ụzọ Cemetry. Tochukwu Ogbuagu, onye ntaakuko na Aba kọwara na enweghị ihe mere ụzọ Cemetery Aba. O kwukwara na vidiyo ahụ bu ihe mere na afọ gàrà aga bu 2023.

Ọzọkwa, Sylvester Eze bị na power line nke dị nso na ụzọ Cemetry kuru di ka Maazị Ogbuagu na vidiyo ahụ si na afọ gàrà aga. Ọ kọwara na a ka na-arụzi igbapu mmiri n’ihi na gọọmenti nwere okwu na Nigeria Railway Corporation ka ya bu igbapu mmiri ga-esi gafere ya.

Anyị jụkwara ma enweela nnukwu mmiri ozuzo, mmadu abụọ ahụ Dubawa gwara okwu kwuru na mmiri ka na-amalite, na enwebeghị mmiri ozuzo nwere ike ibute idei mmiri.

Nchịkọta

Vidiyo nke onye no X platform bụ @DavidOffor tinyere, wee dee na idei mmiri tochiri ụzọ dị na Aba nke gọvanọ Alex Otti rụrụ nso nso a, na eduhie eduhie. Dubawa chọpụtara na vidiyo ahụ sitere na Septemba afọ gara aga mgbe idei mmiri tochiri okporo ụzọ Cemetry na Aba, mana okporo ụzọ a emebighi emebi.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke Dubawa na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

Exit mobile version