September 21, 2024
FactCheck (Igbo)

Nyocha Eziokwu: Ụgha! Imo steeti agaghị ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric di ka nke Abia Steeti

Featured Image: Geometric power plant in Abaa Abia State. (Premium Times)

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E kwuru

Otu onye na X @Royal_Spotlight@Royal_Sportlight na ụbọchị March 24 na afọ 2024, kwuru na Imo steeti na akwado imalite ụlọ ọrụ ike geometric ka ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti na Eprel 1, 2024.

Ihe Anyị Chọpụtara

Ụgha! Nchọpụta Dubawa mere na mgbasa ozi ọha nke gọọmentị Imo steeti, egosighi ihe ọ bụla gbasara ụlọ ọrụ ike geometric. Gọọmenti mere naanị ọkwa gbasara bịanyere aka na nkwekọrịta nghọta (MoU) ya na Elsewedy Group.

Akụkọ N’uju

Otu onye no na X @Royal _Sportlight na March 24, tinyere ihe onyonyo ebe foto gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti nọ na foto ụlọ ọrụ ike geometric.

N’ịdepụta vidiyo ahụ na X, @Royal_Spotlight dere, ”Imo steeti ga-ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric dị ụzọ abụọ ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti na 1st Eprel.” Kemgbe o dere ihe ahụ, mmadu puku iri abụọ na anọ ekirila ya.

Nyocha 

Nleba anya na akaụntụ mgbasa ozi ọha nke ọchịchị Imo steeti na gọvanọ Uzodimma nke Dubawa mere, gosiri na enweghị ebe ahụrụ ihe onye nọ na X kwụrụ.

Cheta na n’ubọchi iri abụọ na asaa nke ọnwa Febụwarị, osote onye isi ala Naịjirịa bụ Kashim Shettima mepere ụlọ ọrụ ọkụ geometric nwere megawatt 188 n’Aba, steeti Abia, iji mee ka ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-enwe ọkụ kwa mgbe.

Ụlọ ọrụ ọkụ ahụ, nke a kọwara dị ka ụlọ ọrụ ọkụ eletrik mbụ jikọtara ọnụ na Naịjirịa, dị na mpaghara mmepụta ihe nke Osisioma na steeti ndịda-ọwụwa anyanwụ.

Na ibe Facebook nke Hope New Media Center, nke gọọmentị Imo steeti, edere na Maachị 15, 2024, na mgbe Gọvanọ Uzodimma mere njem azụmahịa na Cairo iji nweta ndị na-achụ ego, o bịanyere aka na nkwekọrịta nghọta (MoU) na Elsewedy Group.

Ruo ugbu a, ọ nweghị ụlọ ọrụ mgbasa ozi ama ama n’Imo ma ọ bụ Naịjirịa, kọpụtara na Imo steeti ga-ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric ka ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti.

Nchịkọta

Nke a bụ ụgha n’ihi na enweghị ike ịchọpụta ya ebe ọ bụla.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke Dubawa na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

Leave feedback about this

  • Quality
  • Price
  • Service

PROS

+
Add Field

CONS

+
Add Field
Choose Image
Choose Video