Ọ Bụ Eziokwu Na Enweghị Ndị Igbo Ọbula So Na Ndị ọrụ Na Ọchịchị Nke Onyeisiala Tinubu?

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E Kwuru

Otu onye nọ na X bụ 99% OPPRESSED  na uboọchị asato n’onwa April kwụrụ na ndị Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu erughi mmadu abụo.

Ihe Anyi Chọpụtara

Ụgha! Site na nhọpụta onyeisiala Tinubu mere na afọ gara aga, DUBAWA hụrụ na ndị Igbo karịrị mmadụ ise so na ndị ndụmọdụ pụrụ iche na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu.

Akụkọ N’uju

Otu onye no na X bụ 99% OPPRESSED kwụrụ na onweghi ndi Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu.

N’okwu ya, 99% OPPRESSED siri n’ime ọtụtụ ndị ọrụ nọ na AsoRock, enweghị oburugodi ndị Igbo abụọ so na ọchịchị Tinubu. O kwupụtara na ọdị nwute si na kamgbe ọchịchị Tinubu bidoro na afọ gara aga, onweghi onye Igbo ọbula so arụ ọrụ.

Nyocha

Nke mbụ, DUBAWA chọpụtara na ọnwa Septemba na afọ gara aga, mgbe onyeisiala Tinubu hoputara mmadụ ise bụ ndị ndụmọdụ mgbasa ozi, otu onye nta akụkọ bụ Fredrick Nwabufo so na ndi ahoputara.

Ka akwụkwọ Punch sịri kọputa, Mazị Nwabufo, onye odeakụkọ na ọkachamara nzikọrịta ozi, ka a họpụtara ka ọ bụrụ onye enyemaka pụrụiche maka nkwekọrịta ọha.

Maazi Nwabufo bụ onye Ọba nke dị ná Idemili Local Government Area nke steeti Anambra, Nigeria

Foto: Frederick Nwabufo

Onye Igbo ọzọ nke onyeisiala Tinubu hoputara na ndị ndụmọdụ pụrụ iche na ọchịchị ya bụ Chioma Nweze. Ahoputara Oriakụ Nweze dika onye ndụmọdụ pụrụ iche maka mmekọrịta obodo (South-East)

Oriakụ Nweze rụburu ọrụ dị ka kọmishọna na ahụ maka ahia na ochichi Dave Umahi, onye chiburu Steeti Ebonyi.

Foto: Chioma Nweze

Na afọ gara aga (September 2023), onyeisiala Bola Tinubu hoputara Stanley Nkwocha dika ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala Naijiria bụ Kashim Shettima. Stanley Nkwocha bụ onye nta akụkọ kemgbe afọ irí abụọ, na ọkachamara na ihe gbasara mgbasa ozi.

Foto: Stanley Nkwocha

Onyeisiala Bola Tinubu hoputara ndị Igbo ịse bụ minista, ndị a gụnyere; Dave Umahi, Uju Kennedy, Nkiruka Onyejeocha, Uche Nnaji ya na Doris Uzoka-Anite.

Foto a bụ minista ise ndị Igbo onyeisiala Tinubu hoputara

Nchịkọta

Ihe onye no na X kwụrụ si na onweghi ndi Igbo ọbula so ndi ọrụ na ọchịchị onyeisiala Tinubu, bụ ụgha.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke Dubawa na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba

  • Related Posts

    FACT-CHECK: FALSE! Nigerian Army didn’t recycle old photos to depict recent operation in Imo

    Introduction The security situation in Imo State has transitioned from a period of high volatility to a phase of gradual recovery as of early 2026. This shift is primarily attributed…

    FACT-CHECK:  FALSE! Asari Dokubo not being monitored by Mossad as a terrorist

    Introduction After President Donald Trump of the United States threatened military action in Nigeria over the alleged killing of Christians by radical Islamic terrorists in November 2025, the former Niger…

    Leave a Reply

    Your email address will not be published. Required fields are marked *

    You Missed

    Six Allies Back Push To Secure Safe Passage Through Hormuz Strait

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 2 views
    Six Allies Back Push To Secure Safe Passage Through Hormuz Strait

    IMF raises concern over global inflation, output over Iran war

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    IMF raises concern over global inflation, output over Iran war

    Report: FBI probing US counterterrorism director who resigned over Iran war

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Report: FBI probing US counterterrorism director who resigned over Iran war

    Three police officers, 5 civilians killed in Taraba attack

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Three police officers, 5 civilians killed in Taraba attack

    Again, Iran threatens to destroy region’s energy facilities if attacked

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Again, Iran threatens to destroy region’s energy facilities if attacked

    Iran Hits Saudi, Kuwaiti Oil Refineries In Latest Attacks

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Iran Hits Saudi, Kuwaiti Oil Refineries In Latest Attacks