September 21, 2024
FactCheck (Igbo)

Nyocha Eziokwu: Ọ bu asụsụ Ìgbo na French ka akacha asụ na uwà níle?

Feature image: Symbol of Igbo (Obinnwanne news

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E Kwuru:

Na ọnwa Febụwarị 26, afọ 2022, Akwụkwọ akụkọ Odogwu Blog bipụtere akụkọ dèrè na otu onye nta akụkọ bụ Dilibe Michael kwụrụ na asụsụ Igbo na French ka akacha asụ na ùwà nílé.

Ihe Anyi Chọpụtara:

Ụgha! Mgbe DUBAWA lebara anya na weebụsaịtị dị iche iche na kwa weebụsaịtị ama ama bu Statista , anyị chọpụtara na ọ bu asụsụ English na Mandarin Chinese ka akacha asụ na ùwà nílé. Ọzọkwa, Dubawa chọpụta na enweghị akwụkwọ akụkọ ọzọ doro anya nkè dere ihe Maazị Dilibe Michael kwụrụ na asụsụ Igbo na French ka akacha asụ na ùwà nílé.

Akụkọ N’uju

Na Febụwarị 26, afọ 2022, akwụkwọ akụkọ bu Odogwu Blog bipụtere akụkọ dere na onye nta akụkọ bu Dilibe Michael kwụrụ na asụsụ Igbo na French ka akacha asụ na ùwà nílé.

Dika akwụkwọ Odogwu Blog si dee, Maazị Michael kwụrụ nke a ka ọ hụchara ezinụlọ China dị iche iche na-asụ Igbo.

“Ihe onyonyo gosiri ndị mba ọzọ na-asụ Igbo si mba dị iche iche dịka UK, USA, China na Turkey,” Maazị Michael kwụrụ.

Nyocha

Ma Mgbe DUBAWA chọrọ na Google, ihe a Dilibe Michael kwụrụ, anyị chọpụta na ọ bu soso ndị Odogwu Blog  bipụtere akụkọ a. Anyị aghughị Ihe dị etu a na akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ ama ama.

Sịte na weebụsaịtị dị iche iche na kwa weebụsaịtị ama ama bu Statista, anyị chọpụtara na ọ bu asụsụ bekee na Chinese Mandarin ka akacha asụ na ùwà nílé.

Statista chọpụtara n’afọ 2023, enwere ihe dị ka ijeri mmadụ 1.5 n’ụwa niile na-asụ bekee n’asụsụ ala ma ọ bụ asụsụ nke abụọ, karịa karịa ijeri 1.1 ndị na-asụ Chinese Mandarin n’oge nyocha. Hindi na Spanish bụ asụsụ nke atọ na nke anọ kacha gbasaa ebe niile n’afọ ahụ.

Onye Bu Dilibe Michael?

Ka weebụsaịtị Muck Rack si dee, Dilibe Michael bụ onye nta akụkọ Naijiria bu kwa onye na-ede blọgụ.

Nchịkọta

Ọ bụghị asụsụ Igbo na French ka akacha asụ na mba ụwa, anyị chọpụtara na ọ bu asụsụ bekee na Mandarin Chinese ka akacha asụ na mba ụwa.

This report was produced for DUBAWA 2024 Kwame KariKari language Fellowship in partnership with CrimeFacts news to facilitate the ethos of “truth” in journalism and enhance media literacy in the country.

Leave feedback about this

  • Quality
  • Price
  • Service

PROS

+
Add Field

CONS

+
Add Field
Choose Image
Choose Video