Ugha! Steeti Abia etughi ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị Gọvanọ Alex Otti na afọ gara

FPacasl Ibe dere nyocha a 

Ihe E Kwuru: Onye nọ na X bụ @MO_Shaibu  kwụrụ na Steeti Abia turu ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị Gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Ihe Anyi Chọpụtara: Ụgha! DUBAWA chọpụtara na enweghị mgbe ọ bụla Steeti Abia turu ugo dịka steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ n’afọ gara aga.

Akụkọ N’uju

Otú onye na X aha ya bụ @MO_Shaibu  kwụrụ na steeti Abia turu ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Ihe @MO_Shaibu dere na Na úbọchị 4 nke ọnwa Eprel na afọ 2024, nwetara nlele karịrị puku iri na asatọ. O nwetakwara mmasị na ntusa karịrị otu puku na X.

Otu n’ime ndị kwụrụ okwu na X platform, banyere ihe a, aha ya bụ @Mr_Amagu,  tinyere foto gosiri na minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Onye no x tinyere foto a nke gosiri nsọpụrụ minista na ahụ maka aku, uba na nhazi na ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia dika steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.
Nyocha

Mgbe DUBAWA chọrọ na Google, enweghị akwụkwọ ọ bụla dere na ọ bu steeti Abia kacha mee ọfuma na Naijiria na otu afọ gara aga.

Anyị ahughi ebe ọbula minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia nsọpụrụ dịka steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Ka akwụkwọ Budgit sịri bipụte, Steeti Rivers bụ steeti mbụ kacha mee ọfuma na Naijiria na afọ 2023. Steeti anọ ndị ọzọ na esote Rivers gụnyere: Lagos, Ebonyi, Kaduna na Anambra steeti.

Akwụkwọ PROSHARE dere na ọ bu steeti Gombe, Jigawa, Ekiti, Lagos, na FCT kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Akwụkwọ Leadership kwụrụ na ọ bu steeti Lagos, FCT, Oyo bụ steeti ka mee ọfuma na ihe gbasara akụ na uba na afọ 2023.

Nchịkọta

DUBAWA chọpụtara na enweghị mgbe minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiriai bụ Maazị Bagudu nyere steeti Abia nsọpụrụ dika steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Dika akwụkwọ akụkọ dị iche iche siri bipụte, anyị hụrụ na ọ bụghị steeti Abia kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

  • Related Posts

    Ọ Bụ Eziokwu Na Enweghị Ndị Igbo Ọbula So Na Ndị ọrụ Na Ọchịchị Nke Onyeisiala Tinubu?

    Pascal Ibe dere nyocha a  Ihe E Kwuru Otu onye nọ na X bụ 99% OPPRESSED  na uboọchị asato n’onwa April kwụrụ na ndị Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị…

    Owerri Abụ Obodo Kacha Dị Ọcha Na Mpaghara Odida Anyanwu Naijiria?

    Pacasl Ibe dere nyocha a Ihe E Kwuru  Onye nọ na X platform aha ya bu @harri_onuoha  na uboọchị 31 n’ọnwa March, kwụrụ na Owerri bu obodo kacha dị ọcha…

    Leave a Reply

    Your email address will not be published. Required fields are marked *

    You Missed

    Ogun prison: Mother nabbed trying to ‘sneak in drug’ for son on Death Row

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 6 views
    Ogun prison: Mother nabbed trying to ‘sneak in drug’ for son on Death Row

    EFCC dismissed over 40 staff for corruption, financial malpractice in three years — Chairman

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 6 views
    EFCC dismissed over 40 staff for corruption, financial malpractice in three years — Chairman

    EXTRA: Borno Commissioner threatens to cut off fingers of those who vote against APC

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 8 views
    EXTRA: Borno Commissioner threatens to cut off fingers of those who vote against APC

    EFCC recovers N1.23tn, $684m in 32 months – Olukoyede

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 13 views
    EFCC recovers N1.23tn, $684m in 32 months – Olukoyede

    Crude Prices Rise Above $90 Per Barrel On US-Iran Strikes

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 6 views
    Crude Prices Rise Above $90 Per Barrel On US-Iran Strikes

    Court remands Brazil-based Nigerian businessman over ‘importation of cocaine’

    • By admin
    • August 31, 2026
    • 7 views
    Court remands Brazil-based Nigerian businessman over ‘importation of cocaine’