September 21, 2024
FactCheck (Igbo)

Ugha! Steeti Abia etughi ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị Gọvanọ Alex Otti na afọ gara

File photo: Abia State Governor, Alex Otti (Channels Television)

FPacasl Ibe dere nyocha a 

Ihe E Kwuru: Onye nọ na X bụ @MO_Shaibu  kwụrụ na Steeti Abia turu ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị Gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Ihe Anyi Chọpụtara: Ụgha! DUBAWA chọpụtara na enweghị mgbe ọ bụla Steeti Abia turu ugo dịka steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ n’afọ gara aga.

Akụkọ N’uju

Otú onye na X aha ya bụ @MO_Shaibu  kwụrụ na steeti Abia turu ugo dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Ihe @MO_Shaibu dere na Na úbọchị 4 nke ọnwa Eprel na afọ 2024, nwetara nlele karịrị puku iri na asatọ. O nwetakwara mmasị na ntusa karịrị otu puku na X.

Otu n’ime ndị kwụrụ okwu na X platform, banyere ihe a, aha ya bụ @Mr_Amagu,  tinyere foto gosiri na minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia dika steeti kacha mee ọfuma na ọchịchị gọvanọ Alex Otti n’afọ gara aga.

Onye no x tinyere foto a nke gosiri nsọpụrụ minista na ahụ maka aku, uba na nhazi na ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia dika steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.
Nyocha

Mgbe DUBAWA chọrọ na Google, enweghị akwụkwọ ọ bụla dere na ọ bu steeti Abia kacha mee ọfuma na Naijiria na otu afọ gara aga.

Anyị ahughi ebe ọbula minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiria bụ Maazị Atiku Bagudu nyere steeti Abia nsọpụrụ dịka steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Ka akwụkwọ Budgit sịri bipụte, Steeti Rivers bụ steeti mbụ kacha mee ọfuma na Naijiria na afọ 2023. Steeti anọ ndị ọzọ na esote Rivers gụnyere: Lagos, Ebonyi, Kaduna na Anambra steeti.

Akwụkwọ PROSHARE dere na ọ bu steeti Gombe, Jigawa, Ekiti, Lagos, na FCT kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Akwụkwọ Leadership kwụrụ na ọ bu steeti Lagos, FCT, Oyo bụ steeti ka mee ọfuma na ihe gbasara akụ na uba na afọ 2023.

Nchịkọta

DUBAWA chọpụtara na enweghị mgbe minista na-ahụ maka mmefu ego na atụmatụ mba ala Naijiriai bụ Maazị Bagudu nyere steeti Abia nsọpụrụ dika steeti kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Dika akwụkwọ akụkọ dị iche iche siri bipụte, anyị hụrụ na ọ bụghị steeti Abia kacha mee ọfuma na afọ gara aga.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

Leave feedback about this

  • Quality
  • Price
  • Service

PROS

+
Add Field

CONS

+
Add Field
Choose Image
Choose Video