Nyocha Eziokwu: Ụgha! Imo steeti agaghị ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric di ka nke Abia Steeti

Pascal Ibe dere nyocha a 

Ihe E kwuru

Otu onye na X @Royal_Spotlight@Royal_Sportlight na ụbọchị March 24 na afọ 2024, kwuru na Imo steeti na akwado imalite ụlọ ọrụ ike geometric ka ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti na Eprel 1, 2024.

Ihe Anyị Chọpụtara

Ụgha! Nchọpụta Dubawa mere na mgbasa ozi ọha nke gọọmentị Imo steeti, egosighi ihe ọ bụla gbasara ụlọ ọrụ ike geometric. Gọọmenti mere naanị ọkwa gbasara bịanyere aka na nkwekọrịta nghọta (MoU) ya na Elsewedy Group.

Akụkọ N’uju

Otu onye no na X @Royal _Sportlight na March 24, tinyere ihe onyonyo ebe foto gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti nọ na foto ụlọ ọrụ ike geometric.

N’ịdepụta vidiyo ahụ na X, @Royal_Spotlight dere, ”Imo steeti ga-ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric dị ụzọ abụọ ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti na 1st Eprel.” Kemgbe o dere ihe ahụ, mmadu puku iri abụọ na anọ ekirila ya.

Nyocha 

Nleba anya na akaụntụ mgbasa ozi ọha nke ọchịchị Imo steeti na gọvanọ Uzodimma nke Dubawa mere, gosiri na enweghị ebe ahụrụ ihe onye nọ na X kwụrụ.

Cheta na n’ubọchi iri abụọ na asaa nke ọnwa Febụwarị, osote onye isi ala Naịjirịa bụ Kashim Shettima mepere ụlọ ọrụ ọkụ geometric nwere megawatt 188 n’Aba, steeti Abia, iji mee ka ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-enwe ọkụ kwa mgbe.

Ụlọ ọrụ ọkụ ahụ, nke a kọwara dị ka ụlọ ọrụ ọkụ eletrik mbụ jikọtara ọnụ na Naịjirịa, dị na mpaghara mmepụta ihe nke Osisioma na steeti ndịda-ọwụwa anyanwụ.

Na ibe Facebook nke Hope New Media Center, nke gọọmentị Imo steeti, edere na Maachị 15, 2024, na mgbe Gọvanọ Uzodimma mere njem azụmahịa na Cairo iji nweta ndị na-achụ ego, o bịanyere aka na nkwekọrịta nghọta (MoU) na Elsewedy Group.

Ruo ugbu a, ọ nweghị ụlọ ọrụ mgbasa ozi ama ama n’Imo ma ọ bụ Naịjirịa, kọpụtara na Imo steeti ga-ewepụta ụlọ ọrụ ike geometric ka ụlọ ọrụ ike geometric nke Abia Steeti.

Nchịkọta

Nke a bụ ụgha n’ihi na enweghị ike ịchọpụta ya ebe ọ bụla.

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke Dubawa na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

  • Related Posts

    Ọ Bụ Eziokwu Na Enweghị Ndị Igbo Ọbula So Na Ndị ọrụ Na Ọchịchị Nke Onyeisiala Tinubu?

    Pascal Ibe dere nyocha a  Ihe E Kwuru Otu onye nọ na X bụ 99% OPPRESSED  na uboọchị asato n’onwa April kwụrụ na ndị Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị…

    Owerri Abụ Obodo Kacha Dị Ọcha Na Mpaghara Odida Anyanwu Naijiria?

    Pacasl Ibe dere nyocha a Ihe E Kwuru  Onye nọ na X platform aha ya bu @harri_onuoha  na uboọchị 31 n’ọnwa March, kwụrụ na Owerri bu obodo kacha dị ọcha…

    Leave a Reply

    Your email address will not be published. Required fields are marked *

    You Missed

    Six Allies Back Push To Secure Safe Passage Through Hormuz Strait

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 2 views
    Six Allies Back Push To Secure Safe Passage Through Hormuz Strait

    IMF raises concern over global inflation, output over Iran war

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    IMF raises concern over global inflation, output over Iran war

    Report: FBI probing US counterterrorism director who resigned over Iran war

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Report: FBI probing US counterterrorism director who resigned over Iran war

    Three police officers, 5 civilians killed in Taraba attack

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Three police officers, 5 civilians killed in Taraba attack

    Again, Iran threatens to destroy region’s energy facilities if attacked

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Again, Iran threatens to destroy region’s energy facilities if attacked

    Iran Hits Saudi, Kuwaiti Oil Refineries In Latest Attacks

    • By admin
    • March 19, 2026
    • 3 views
    Iran Hits Saudi, Kuwaiti Oil Refineries In Latest Attacks